ISI MBIDO
 Ibido



Ntughari

'العربية / al-ʿarabīyah
Bahasa Indonesia
Български език
Català
中文 / Zhōngwén
Deutsch
English
Español
Euskara
Ewe
Filipino/Tagalog
Français
Galego
Ελληνικά / Elliniká
Igbo
हिन्दी / hindī
Italiano
日本語 / Nihongo
Kiswahili
한국어 / hangugeo
بهاس ملايو / Bahasa Melayu
Português
Română
Русский
Српски / Srpski
>తెలుగు /Telugu
ไทย / Thai
Türkçe
اردو / Urdu

                                        

Mpeji Ndi Ozo:

Ihe Nkuzi

Ihe Ntuzi Aka

Isi Okwu Ndi Gbara Okpurukpu

Contact

Akwukwo Ndi Bara Uru

Ebe Ndi Bara Uru

MGBASA OZI

Na ewelighi olileanya

Nke Phil Bartle, PhD

Nke onye tughariri bu Mr. Innocent Nwuzu, B.Sc., (Nsukka, Nigeria)


Akwukwo Ozuzu

Mee ihe ka ihe mee otu o kwesiri megide uche nezighi ezi

I kwadosia onwe gi,ma nwetakwa ikike site n'aka ndi ochichi, o bu oge igba ndi obodo ume ka ha banye n'olu.

I ga e bido nke a site na-ikpo nzuko oha na ndi ime obodo. Nke a ga ebido "mgbasa ozi" maka ihe ndi a ga-eme.

I nwere ike hu na obu mmadu ole na ole na-abia nzuko. O nwere ike buru umu nwoke ga-abia buru n'uche na umu nwanyi agaghi abia. Oru gi bu ime ka umu nwanyi na-abia nzuko.

Otu a ka odikwa nye ndi nke ozo kwesiri ibia: ndi ntorobia, ndi olusi, ndi otu pere mpe n'onu ogu, ndi ihere,ndi otu okpukpere nta, ndi na-agaghi akwukwo, ndi ogbenye na ndi a na-emekpa ahu.

Mgbe i bidoro kwuwa maka nsogbu nke ime obodo, na i ju ihe ndi na-akpa ha karia, he nwere ike chee na i na acho i gboro ha mkpa ha. I ghaghi ime ka owee ha anya ma mee ka ha mara na ha ga-egbo mkpa diiri ha; na ihe i nwere ike imere ha bu ituziri ha aka-obughi igboro ha mkpa ha.

Otu aka ahu, ha nwekwara ike chee na I ga enye ha akorongwa. Mee ngwa n'uzo o ga-ewe ha anya na o bughi ezi okwu, ma kowaa na ha ga achota ma roputakwara onwe ha akorongwa; ihe i ga-emere ha bu ntuzi aka.

I ga- amuta ka e si eji akuko, ilu na ihe yiri ihe wee kowaara ha isi okwu. Otu n'ihe ndi a bu: "A si la ehi ka onye gi akwa, a si la okuko ka onye gi mmiri ara ehi"

I no ebe ahu inye ozuzu nchikota na abgam ume; i noghi ebe ahu i weputa ego, igwe ma obu ihe e ji aru ulo.

I gaghi akwusi ndi mmadu iche ihe n'obi ha. Ha ga na-echeriri echiche

I ga agbadosi ukwu ike megide echiche obula nke ga-eme ka ha chee echiche na ezighi ezi (na i ga aroputara ha akoro ngwa oru). O buru na i meghi nke a, ha ga a bu ndi agharipuru nke ga emekwa ka oru i ruru buru ihe efu. Ndi mmadu ga akuru na ikwere ha nkwa i nye ha akoro ngwa olu ma gharipu n'imezu nkwa i kwere.

O buru na i choro ime ka a mata, obu i mata gini?

Cheta kwa na ihe i choro inweta di iche na ihe ndi obodo choro.

Ha nwere ike choo mmiri onunu, ulo ogwu, ulo akwukwo ma o bu okporo-uzo.

I choro ka ndi ime obodo gbaise ike ma kwuru onwe ha, belata ubiam, welite ikike nwoke na nwanyi, kwalite ochichi. Ihe I choro ka ha mata bu na ha nwere ike ikwuuru onwe ha ma gbasie kwa ike na -agbanyeghi otu ha si daa ubiam. Ihe ha kwesiri ime bu itinye uchu maka ime nke a, nakwa ozuzu nke nlekota nke m nwere ike i nye.

Izi ozi nke na-enweghi ugha n'ime ya bara uru (gbanari iweta olileanya ugha)

––»«––

© Onye odee 1967, 1987, 2007 Phil Bartle
Web Design by Lourdes Sada
––»«––
Mgbe ikpeazu e deghariri ihe omumu a: 2012.10.07

 Mbido

 Ibido