ISI MBIDO
 Ibido


Ntughari:

Arabic
Bahasa Indonesia
Bulgarian
English
Español
Francais
Hindi
Italiano
Português
Russian
Thai
Urdu

Udidi Ndi Ozo:

Text
Power Point

Mpeji Ndi Ozo:

Ihe Nkuzi

Ihe Ntuzi Aka

Isi Okwu Ndi Gbara Okpurukpu

Contact

Akwukwo Ndi Bara Uru

Ebe Ndi Bara Uru

I MA NDI OBODO AKA NA IHU

I kpo gani gani na eweta ume

nke Phil Bartle, PhD

Onye tughariri bu Mr. Nwuzu Innocent, B.Sc. (Nsukka)


Akwukwo ozuzu

Ebe I choro ka ndi ime obodo nwee ume, i gaghi anabata na egbughi oge ma na-atuleghi na mbu ihe ndi ahu nke di ka ihe ndi obodo choro karia.

Ikpo gani gani na e weta ume; akwara aka gi ga agbasi ike ma i kwaa ihe na anyi aru aka

O buru na aka gi e mebeghi ihe siri ike, o gaghi esi ike, o buru na i meere obodo ihe nile, ha agaghi agbasi ike

Alo mbu nke ndi obodo nwere ike buru nke a na echeghi eche nke oma ma weputa, i maa ha aka nihu, ha ga eche echiche nke oma maka ihe i nwere ike ime.

Ka anyi lee anya na ihe ima atu a.Eleghi anya ndi obodo siri na ha choro ulo ogwu karisia ihe ndi ozo na akpa ha.

"O di mma,"zaa ha, "Gini bu ebum n'uche unu ji horo ulo ogwu?" "Ndi obodo ha nwere ike iru ma chekwaa ulo ogwu?" "Kedu mkpa ndi ulo ogwu ga egbo? Kedu nsogbu ndi o ga e bute?"

Gbaa ha ume site na ime ka ha kwusie ike na nhoro ha.

O buru na ha choro ulo ogwu maka na ndi obodo na amarita ha aka nihu nwere ulo ogwu, ma obu nihi mpako, emee ka o wee ha anya.

"Cheta kwa na o bu ego gi ka a ga e ji ruo olu; o bu otu a ka i choro i ji mefuo ego gi?" Otu a ka i ga- agwa ha.

O nwere ike ha asi na umuaka ha na-anwusi, na nke a bu ebu m n'uche ha.

Nke a bu ohere ikowara ha uru PHC (ahu ike); >na mgbochi oria ka ogwugwo mma.

Na umuaka na anwu site na oria afo osisa na oria ndi ozo e si na mmiri na enweta. Gaa hu Mmiri.

Ulo ogwu nwere ike nye aka gwoo oria, mana o ka mma, di kwa onu ala, ma na enweghi ihe oghom iwedata oria e si na mmiri ebute site n'ime ihe ato ndi a: (1) ozuzu maka ahu ike nke ga agbanwe agwa, (2) i nye mmiri onunu di ocha, na (3) i me ocha nke na ewezuga inyi puo na ebe mmiri onunu di. Mgbochi kama ogwugwo.

I ma ndi obodo aka n'ihu site na ime ka ha tulee nsogbu ha ma choputa uzo e si egbo ha, ha nwere ike tulegharia ihe ndi ha choro nke na akpasi ha ike.

A nabatala ntuputa nke mbu ha na ebughi uzo tulee ya.

––»«––

Last update: 2009.01.12

 Mbido

 Ibido